Psalms 14

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.

Ajọ omume nke ndị na-emebi iwu

1Onye nzuzu na-asị
Maọbụ, na-eche
nʼime obi ya,
“Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.”
Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.

2 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe
na-ele ụmụ mmadụ anya
ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta
onye nke na-achọ Chineke.
3Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi,
ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.

4Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe?

Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri,
ha adịghị akpọkukwa Onyenwe anyị.
5Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu,
nʼihi na Chineke nọ nʼetiti ndị ezi omume.
6Unu ndị ajọ omume na-emebi atụmatụ ndị ogbenye,
ma Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba ha.

7A sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta!
Mgbe Onyenwe anyị ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha,
ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!
Copyright information for IboBIU